Asụsụ Igbo Bụ Ọgwụ Mgbochi Ime Mmụọ: Olile Anya Ya Site N’egwu Ndị A Họọrọ
Conference: ISA 22nd Annual International Conference (2025)
Presenter(s): Onyinye Constance Amamgbo, Ifunanya Nzubechukwu Dimebo
Tags: 2025 Nnamdi Azikiwe University Alex Ekwueme Federal University Awka
Abstract
Nchọcha a gbadoro ụkwụ etu asụsụ Igbo si agwọ ọrịa ime mmụọ na olileanya ya site n’egwu ndị a họọrọ. Ndị Igbo bụ ndị ji asụsụ ha kpọrọ ihe mana echemi echiche ime Mgbe ọ bụla ha na-etinye asụsụ ha n’ọrụ tụmadị ebe ọ metụtara ihe ime mmụọ. Ọnọdụ dị otu a na-aputakarị ihe site n’egwu ụfọdụ ndị Igbo na-agụ. Egwu bụ une nke na-eji nwayo edeba n’ime obi mmadụ dị ka ngwaọrụ pụrụ iche. Ihe kpalitere mmụọ ndị nchọcha bụ izipụta egwu ụfọdụ ndị na-agwọ ọrịa ime mmụọ n’ebe ọ pụrụ iche ma mee ka ndị mmadụ mata mkpa ọ dị na ndụ n’ihi na ọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ n’ụwa nwere egwu kwesiri ya. Ihe ndị nchọcha bụ n’obi bụ ịchọpụtagasi egwu ndị ahụ na-enye aka n’iwulite mmụọ, gwọọ ọrịa, gbaziere ndị mmadụ ụzọ ka mma. Atụtụ mgbakwasa ụkwụ bụ atụtụ mburupụtaụwa, nsinaụbụrụ na nsinagburugburu. Nchọcha a gosiri na ụfọdụ egwu na-eme ka ndị mmadụ chemie echiche ime chikọta ime mmụọ ha site na inwe ọnọdụ udo nke mkpụrụ obi nye ndị ahụ ma ọ bụ gwọọ ọria n’ụzọ pụrụ iche. Nchọcha a bụ nchọcha nkọwasi na nkọwami site n’egwu ndị a họọrọ nakwa ndị nọburu na ọnọdụ ahụ n’oge gara aga. N’ikpeazụ, ndị nchọcha mejupụtara ebumnoobi ha site n’ime ka ohanaeze mata na egwụ apụghị iwepụta mma ya, rụọ ọrụ ya ma ọ buru na o siteghị n’asụsụ.
7 views