Nzipụta Ụkpụrụ Afrịka n’Ulọọrụ Ntụrụndụ: Nlegara Anya na Naịjirịa
Conference: ISA 22nd Annual International Conference (2025)
Presenter(s): Chioma Chiazom Anagor
Tags: 2025 Nnamdi Azikiwe University Awka Chioma Chiazom Anagor
Abstract
Mba Afrịka nke Naịjirịa nọ na ya nwere ụkpụrụ e ji mara ha nke ha na-akụziri ụmụ ha, na-emepụta n’omume ma na-ezipụtakwa n’obibindụ ha. Ha nwere ọtụtụ ihe ha na-asọ nsọ ma nwekwaa ihe ndị ha hụtara ka ihe kwesịrị nṅomi. Ụfọdụ ụkpụrụ ha gụnyere; nwoke ị na-eme ka nwoke, nwaanyị a bụrụ nwaanyị, ezi agwa, ikwụba aka ọtọ, ịgba mbọ dgz. Mmalite nzipụta ihe ederede na nke nkiri n’ụlọọrụ ntụrụndụ wetara ma nke dị mma ma nke dị njọ mana ọtụtụ ihe a na-ezipụta ma na-edekwa ezipụtaghị ezi ụkpụrụ dị ka etu ụfọdụ ụmụ nwoke si ejizi ejiji ma na-akpakwa agwa ka nwaanyị, ighewe ahụ oghe n’ụdị ejiji, etu ụfọdụ ndị selebriti si ezipụta obibindụ ezighị ezi, nzipụta nsị na aja n’ejije, nzipụta oke ọchịchọ dgz. Ihe ndị a eduhiela ọtụtụ mmadụ ụzọ n’ihi na ọ bụ n’ọwa ịntaneetị ka ọtụtụ si agụta ma na-ahụta ihe ha ji ebi ndụ. Ihe ndị a niile kpatara ederede a iji zipụta mkpa ọ dị ịkatọ ihe ndị a tupu agbụrụ na-abịa echee na ọ bụ usoro obibindụ ndị ala anyị. A ga-eji atụtụ ezi agwa nke Plato tụpụtara wee tụchaa ederede a. A chọpụtara na ọtụtụ ihe ndị a na-ezipụta n’ụlọọrụ ntụrụndụ bụ ụkpụrụ ndị ọcha. Ọ dị mkpa ka ndị isi na-ahụ maka ụlọọrụ ntụrụndụ lebaa anya n’ọtụtụ ihe anaghị ezipụta ezi ụkpụrụ ndị mba Naịjirịa nke a na-ezipụta n’ụlọọrụ a iji hụ na azọtara ndụ ndị ntorobịa ihe ndị a na-ala n’iyi.
6 views