Tuesday, May 06, 2025 - 11:19

Nzipụta Omenala na Ụkpụrụ Ndị Igbo n’Egwu Igbo:Ntụcha Ụfọdụ Akụkọnegwu Mike Ejeagha

Abstract

Ederede a na-eleba anya n’ụfọdụ akụkọnegwu Mike Ejeagha. Akụkọnegwu bụ otu n’ime akụkọ ọdịnala Igbo a na-ejikarị ngwa egwu ezipụta. Mike Ejeagha bụ otu n’ime odogwu ndị Igbo e ji akụkọnegwu mara. Akụkọnegwu ya na-agbadokarị ụkwụ n’akụkọ ọdịnala Igbo ma na-ezipụtakwa omenala, nkwenye na ụkpụrụ ndị Igbo dị iche iche. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo kara nwe mmasị n’egwu ọgbaraọhụụ ụfọdụ ndị Igbo na-etipụta n’oge ugbu a maka inweta ego na ịzara aha karịa ọtụtụ egwu Mike Ejeagha ndị nwere ụkpụrụ ndị Igbo dị iche iche ha na-akụzi. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere nchọcha a nke na-eleba anya na ndụ Mike Ejeagha ma na-atụchakwa egwu ya abụọ ndị a: “Obiakọ” na “Ka e si lee onye isi oche”. A gbasoro atụtụ fọnshọnalịzim wee tụcha egwu ndị a họọrọ. Site na ntụcha e mere, a chọpụtara na nka egwu Mike Ejeagha pụrụ iche ma na-anwapụta mmetụtaobi pụrụ iche na na ndụ ndị ogee ya. Ọzọ, egwu ya na-ezipụtakarị omenala, nkwenye, nkuzi na ụkpụrụ ndị Igbo dị iche iche ga-enyere ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo aka ibi ezi ndụ na ịkpa ezi agwa ga-eweta uto na agamniihu n’ọhaobodo. Ya mere, ederede a na-atụnye aro ka ndị ntorobịa Igbo tinye uchu n’egwu Mike Ejeagha dịka onye ejije mkpaamụ a na-akpọ Brain Jotter mere n’oge gara aga site n’iji akarangwa mgbasaozi ọgbarahụụ dị iche iche wee na-agbasa egwu Mike Ejeagha. Nke a ga-enye aka mee ka ọtụtụ ndị mmadụ soro keta oke n’echiche, nkuzi na ụkpụrụ dị iche iche egwu Mike Ejeagha na-ezipụta.


4 views

Search

Browse by Tag