Omenala Arịrọ: Aka Mgba Chere Ọganihu Steeti Anambra
Conference: ISA 22nd Annual International Conference (2025)
Presenter(s): Esther Ogochukwu Akpulu
Tags: 2025 Esther Ogochukwu Akpulu Mahadum Nnamdị Azikiwe Nnamdi Azikiwe University
Abstract
Ọtụtụ oge, ihe ọjọọ ụfọdụ na-amalite ma gaa n’ihu were ọnọdụ ka a ga-asị na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ma ọ bụ dịkwa ka usoro iwu nabatara. Ihe kpatara nke a bụ ịnabata omenala arịrọ. Omenala arịrọ bụ mmadụ ịrọ ka a ghara ịta ya ahụhụ oge ọ dara iwu. Nke a bụ nnukwu ọdachi dịịrị ọganihu na mmepe obodo ọ bụla ọ kacha Steeti Ananbra. Ọtụtụ oge, omenala arịrọ na-etinye ndị nchekwa iwu n’iri aka azụ iji gbochie ntaramahụhụ nke kwesịrị ịdakwasị onye dara iwu. N’ụzọ dị etu a ọtụtụ mmadụ na-etinye aka n’imebi iwu n’ihi na ha maara na ọ ga-adịrị ha mfe ịrọpụta onwe ha. Ndị nchekwa iwu ụfọdụ na-adanye na nsogbu oge ha jụrụ ịnabata arịrọ. Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ omenala arịrọ, ịchọpụta ụzọ dị iche iche omenala arịrọ si apụta ihe na etu o si echere ọganihu obodo aka mgba, tinyere ụzọ ndị e nwere ike isi gbochie ọnọdụ ọjọọ a. Nchọcha a gbasoro usoro nkọwa. E ji atụtụ Nhazi Ọha were tụchaa ngwa nchọcha. Nchọpụta gosiri na ịnabata arịrọ ma leghara onye dara iwu anya n’ụzọ ime ebere na-akwalite omenala arịrọ n’obodo. A na-atụ alo ka ndị ọrụ nchekwa iwu dị n’aka gbalịsie ike n’ịta onye ọ bụla dara iwu ahụhụ etu o kwesịrị na n’ụzọ ọ ga-esi bụrụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ọzọ. Nke a ga-eme ka a ghara ịdị na-arịọta mgbanarị ntaramahụhụ n’arịrọ maka na omenala arịrọ na-akwatu obodo.
7 views