Igbo Ebinie: O Bughi Igbo Adaa (Igbo Rising, not Igbo Landing)
Conference: The 23rd Annual International Conference of the Igbo Studies Association (ISA) (2026)
Presenter(s): Onwubiko Agozino
Presentation Date: May 14, 2026 @ 01:23 AM
Tags: USA Blacksburg Onwubiko Agozino Virginia Virginia Tech
Abstract
Akwukwo nchoputa m ga egosi na ndi Bekee siri asi mgbe ha kwulu na imerekiti ndi Igbo ndi ntori resiri ndi na agbo ohu si kama ha ga abu ohu, ka ha danye na oshimiri welu nwuo, loghachi uwa na be anyi. Na uche m, nke ahu bu okwu aghugho ndi ocha cholu iji wogbuo ndi be anyi ka anyi buluzia ndi ji aka ha egbu onwe ha. Ma na ka isi okwu ogbako a siri kwuo, Osondu Agwu Ike. Ka Achebe siri gosi na akwukwo ya, Ihe Adagharia (Things Fall Apart), madu iji aka ya gbuo onwe ya bu alu, o bughi ihe ofu onye isi di mma, ma ya foduzia oha na eze, na eme. Ogbugbu mgbuchapu ndi iro gburu ndi Igbo na agha Biafra gosiri na etu o sokwalu ihe sibe ike, Osondu adighi agwu ike. O nwelu onye kwuru udo mgbe agha? Na ebe kwanu? Akwukwo nchoputa m na egosi na ndi Igbo agbalu ohu jisi ike na azo isi onwe ha nke melu na ndi ogba ohu si na anyi anaghi abu ezigbo ohu, na anyi na awa anya di egwu, na anyi na azo ka anyi nwelu onwe anyi, dika Oluada Ekwuoanu ma obu ndi Hayeti (unu anukwalu aha ha na Igbo?). Ya melu m ji si ka anyi bidozie kuzibelu umu anyi na ndi ocha bialu iwogbu anyi mgbe ha kobalu ajambe si na ndi be anyi ji aka ha danye na oshimili si na onwu ka ha mma karia igba ohu. Na uche m, ihe melu bu na ndi be anyi atulu iga bidolu guba egu agha: "Nzogbu Nzogbu, Enyimba Enyi!' Ha si nwa Bekee na ebe amulu dike bu ebe amulu ibe ya maka na isi aka isi. Ha malite banye ha ogu iji nwelu onwe ha, ndi aruru ala ndi ocha welu egba gbagbuo ha tunye ha na oshimili bia na akolu ndi Inshoransi na oke mulu ngwere kpuru. Ashi! Akwukwo nkuzi m ga-adi ka eguriegu (play) igosi ka di nna nwunye siri kuzielu umun ha maka Igbo Ebinie! Ya kpotuba ma madu anwuna!
12 views